Luke 2:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Na mberede, ndị ọzụzụ atụrụ a hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka ọ bịara guzo nꞌihu ha. Ebube Chineke gbakwara ha gburugburu mee ka ìhè jupụta nꞌebe ahụ ha nọ dị ka a ga-asị na ọ bụkwaghị abalị. Oke egwu tụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ahụ.
Igbo 2006
Mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we guzo ha nso, ebube nke Onye-nwe-ayi muba-kwa-ra ha gburugburu: ha we tua egwu nke-uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtara ihe nye ha. Ebube Onyenwe anyị mụwara gburugburu ha, oke egwu tụrụ ha.