Luke 20:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu ụbọchị, Jisọs nọ nꞌụlọ nsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe. Ọ na-ekwusakwa ozi ọma. Ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu na ụfọdụ ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya.
Igbo 2006
O we rue, n'otù nime ubọchi ahu, mb͕e Ọ nēzí ndi-Ju ihe n'ulo uku Chineke, nēzì kwa ozi ọma, na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, ha na ndi-okenye, we guzo Ya nso;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ụbọchị, ka ọ nọ nʼụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe na-ekwusakwa oziọma. Ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị okenye bịakwutere ya.