Luke 20:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zitere otu nꞌime ndị na-ejere ya ozi ka ọ bịakwute ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ anya, ka ha nyekwa ya ụfọdụ nꞌime mkpụrụ ubi ahụ. Ma ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ jidere odibo nwoke ahụ, tie ya ihe, zilaa ya nꞌaka efu.
Igbo 2006
N'oge ighọ nkpuru o we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù, ka ha we nye ya nkpuru ufọdu nke ubi-vine ahu: ma ndi-ọlu-ubi ahu piara ya ihe, zilaga ya n'aka efu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zigara otu nʼime ndị ohu ya ka ọ bịakwute ndị ahụ na-elekọtara ya ubi, ka ha nyekwa ya ụfọdụ nʼime mkpụrụ ubi vaịnị ahụ. Ma ndị na-elekọtara ya ubi jidere ya, tie ya ihe, zilaga ya nʼaka efu.