Luke 20:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ̀ bụghị ịbịa laa ajọ ndị ahụ nꞌiyi werekwa ubi ya tinye nꞌaka ndị ọzọ ndị jikeere inye ya mkpụrụ ruru ya nꞌoge ya? Nꞌezie, nke ahụ bụ nnọọ ihe nwoke ahụ ga-eme.” Mgbe ndị mmadụ ahụ nụrụ akụkọ a Jisọs kọrọ, ha tiri mkpu sị, “Tụfịaakwa! Chineke ekwela! Gịnị mere ha ji mee ihe dị otu a?”
Igbo 2006
Ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ. Ma mb͕e ha nuru ya, ha si, Chineke ekwela.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ ga-abịa, laa ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ nʼiyi, were ubi vaịnị ahụ nye ndị ọzọ.” Mgbe ndị ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Chineke ekwela.”