Luke 20:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌoge ahụ, ndị ozizi iwu na ndị isi nchụaja ghọtara na ọ bụ ha ka Jisọs bu nꞌobi mgbe ọ kọrọ akụkọ ahụ. Ha gbalịrị ijide ya, ma ha ejidekwaghị ya nꞌihi na ha tụrụ egwu ihe ndị mmadụ ga-eme ha.
Igbo 2006
Ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi-nchu-àjà we chọ uzọ itukwasi Ya aka n'otù oge hour ahu; ma ha turu egwu ndi-Ju: n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị ozizi iwu na ndịisi nchụaja chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼotu oge ahụ nʼihi na ha matara na ọ bụ ha ka o bu nʼobi tụọ ilu ahụ, ma ha tụrụ egwu ndị mmadụ.