Luke 20:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị ahụ ha zipụrụ bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Onye ozizi, anyị maara na ihe ị na-ezi na okwu ị na-ekwu bụ eziokwu. Ị dịghị ele mmadụ anya nꞌihu, kama ị na-ezi ihe bụ ụzọ mmadụ ga-esi bịakwute Chineke.
Igbo 2006
Ha we jua Ya, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I nēkwu nēzi kwa ihe ziri ezi, na I dighi-ele kwa madu anya n'iru, kama I nēzí uzọ Chineke n'ezi-okwu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere ndị nnyopụta ahụ jụrụ ya sị, “Onye ozizi, anyị mara na i na-ekwu ma na-ezikwa ihe ziri ezi, matakwa na i dịghị ele mmadụ anya nʼihu, kama ị na-ezi ụzọ Chineke dị ka eziokwu si dị.