Luke 20:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Gosinụ m otu nꞌime mkpụrụ ego unu.” Ha nyere ya otu mkpụrụ ego. Ọ jụrụ ha sị, “Ònye nwe ihu e sere nꞌelu ego a? Ọ̀ bụkwa aha onye ka e dere nꞌelu ya?” Ha zara sị ya, “Ha bụ nke Siza.”
Igbo 2006
Gosinum otù shilling. Ònyinyo na ihe-ndekwasi nke onye ka o nwere? Ha si, Nke Sisa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Gosinụ m otu mkpụrụ ego denarị. Isi onye ka e sere nʼelu ya, aha onye ka e dekwasịkwara ya?” Ha sịrị, “Ọ bụ nke Siza.”