Luke 20:28 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha jụrụ Jisọs ajụjụ a sị, “Onye ozizi, Mosisi dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ọ bụrụ na nwoke lụrụ nwụnye anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne nwoke ahụ ga-alụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, mụta ụmụ ndị ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ.
Igbo 2006
si, Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, na ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, mb͕e o nwere nwunye, ma onye ahu enweghi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ma jụọ ya sị, “Onye ozizi, Mosis deere anyị na ọ bụrụ na nwanne nwoke mmadụ anwụọ hapụ nwunye ya na-amụtaghị nwa, na nwoke dị otu a ga-alụrụ nwunye nwanne ya nwoke ahụ, sị otu a, mụtara nwanne ya ụmụ.