Luke 20:37 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ma banyere ajụjụ unu jụrụ ma ọ bụ ezie na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ, Mosisi nꞌonwe ya gosiri anyị na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. Nꞌihi na mgbe o dere banyere okwu Chineke gwara ya site nꞌime osisi ahụ nwuru ọkụ nꞌọzara, aha ọ kpọrọ Chineke bụ, Chineke nke Eberaham, Chineke nke Aizik na Chineke nke Jekọb.
Igbo 2006
Ma ọbuná Moses gosiri na anēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, nēkwu nime ebe edere okwu bayere Osisi ntà, mb͕e ọ nākpọ Onye-nwe-ayi Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụladị Mosis nʼonwe ya zipụtara na mbilite nʼọnwụ dị, nʼakụkọ banyere ọhịa ahụ na-ere ọkụ, mgbe ọ na-akpọ Onyenwe anyị ‘Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.’