Luke 20:46 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Jienụ onwe unu aka site nꞌebe ndị ozizi iwu nọ. Nꞌihi na ihe ha hụrụ nꞌanya bụ iyi uwe ogologo na-ejegharị ebe nile. Ihe na-atọkwa ha ụtọ bụ ka a na-ekele ha ekele dị iche nꞌime ahịa. Ha hụkwara ịnọdụ nꞌoche dị mkpa nꞌụlọ ekpere na nꞌoge mmemme ọ bụla nꞌanya.
Igbo 2006
Nēzenu ndi-ode-akwukwọ, ndi nāchọ ijeghari n'uwe-nwuda, ndi nāhu kwa ekele n'ọma-ahia nile unu n'anya, na isi oche nile n'ulo-nzukọ nile unu, na isi ọnọdu n'oriri nile unu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Kpacharanụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, ndị hụrụ ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa nʼanya. Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla.