Luke 20:47 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ha bụ ndị na-abakwuru ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ, pụnarị ha ihe ha nwere. Ha na-ekpe ogologo ekpere ka ndị mmadụ too ha. Ha ga-anata ikpe ọmụma dị ukwuu site nꞌaka Chineke.”
Igbo 2006
ndi nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, ndi nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu ha anya: ndia gēnwe ezi ọmuma-ikpé gabigara ókè kari ndi ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha na-eripịa ihe niile dị nʼụlọ ndị inyom ndị di ha nwụrụ anwụ, nʼekpe ogologo ekpere ka a hụta ha. Ndị dị otu a ka a ga-ata ahụhụ dị ukwuu.”