Luke 20:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịkọrọ ndị nọ nꞌebe ahụ akụkọ sị, “Otu nwoke nwere ala ubi ebe ọ kụrụ mkpụrụ vaịnị. Mgbe ọ kụsịrị mkpụrụ vaịnị ahụ, o tinyere ubi ahụ nꞌaka ndị ga-elekọta ya, pụọ gaa nꞌobodo ọzọ ebe ọ ga-anọ ogologo oge.
Igbo 2006
O we malite ituru ndi-Ju ilu a: Otù onye kuru ubi-vini, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ nọdu oge di anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gara nʼihu tụọrọ ndị mmadụ ilu a sị, “Otu nwoke nwere ubi vaịnị, nke o nyefere nʼaka ndị ga-elekọta ya anya ma pụọ gaa njem nʼala ọzọ ebe ọ nọrọ ogologo oge.