Luke 21:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ma tupuu ihe ndị a nile emezuo, ndị mmadụ ga-ejide unu, kpagbuokwa unu. Ha ga-akpọrọ unu gaa nꞌụlọ ekpere ikpe unu ikpe. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-ebo unu ebubo nꞌihu ndị eze na nꞌihu ndị na-achị achị nꞌihi na unu na-eso ụzọ m.
Igbo 2006
Ma mb͕e ihe ndia nile akēmeghi, ha gātukwasi unu aka-ha, sob͕u kwa unu, nārara unu nye n'aka ulo-nzukọ na ulo-nkpọrọ, n'ebe anēduputa unu ga n'iru ndi-eze na ndi-isi n'ihi aham.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide unu, kpagbukwaa unu. Ha ga-enyefe unu nʼaka ọtụtụ ụlọ ekpere. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-akpọpụkwa unu nʼihu ndị eze na ndị ọchịchị nʼihi aha m.