Luke 21:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na aga m enye unu okwu amamihe unu ga-ekwu, ụdị amamihe na okwu nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike imegide ma ọ bụ imeri.
Igbo 2006
n'ihi na Mu onwem gēnye unu ọnu na amam-ihe, nke ndi nile nēmegide unu nāgaghi-apu iguzogide ma-ọbu ikwugide okwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide.