Luke 21:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ebere na-emere m ụmụ nwanyị ji nwa nꞌaka nꞌụbọchị ahụ. Ebere na-emekwara m ụmụ nwanyị na-enye ụmụntakịrị ara nꞌụbọchị ndị ahụ. Ahụhụ dị ukwuu ga-adị nꞌala a, nꞌihi na Chineke ga-egosi iwe ya megide ndị Izirel.
Igbo 2006
Ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu; n'ihi na oké nkpà gādi n'ala nka, iwe gādi-kwa-ra ndi-Ju.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ! A ga-enwe oke ihe mgbu nʼala a, iwe ga-adakwasịkwa ụmụ mmadụ.