Luke 21:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
A ga-eji mma agha gbuo ha, kpụrụ ụfọdụ dị ka ndị a dọtara nꞌagha gaa nꞌobodo dị iche iche nke ụwa. Ndị mba ọzọ ga-achị Jerusalem, mesoo ya mmeso dị ka ha si chọọ, tutuu ruo oge Chineke kara aka na ọchịchị ha ga-agwụ.
Igbo 2006
Ha gāda kwa site n'ọnu mma-agha, agādọta kwa ha n'agha ga na mba nile: ndi mba ọzọ gāzọda Jerusalem n'ala, rue mb͕e oge nke mba ọzọ gēmezu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mma agha ga-egbu ha, mba niile ga-adọrọkwa ha nʼagha. Ndị mba ọzọ ga na-azọtọsị Jerusalem nʼụkwụ ruo mgbe oge nke ndị mba ọzọ ahụ zuru.