Luke 21:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ihe ịrịba ama na ìhè ngosi ga-apụta ìhè nꞌanwụ na nꞌọnwa ya na kpakpando. Oke ịta ahụhụ ga-adakwasịkwa mba nile dị nꞌụwa. Ndị mmadụ ga-anọ nꞌoke mgbagwoju anya. Ụjọ ga-ejupụtakwa obi ha mgbe ọ bụla ebili mmiri nke oke osimiri mere mkpọtụ.
Igbo 2006
Ihe-iriba-ama di iche iche gādi kwa n'anyanwu na ọnwa na kpakpando; n'elu uwa ka nkpab͕u nke mba di iche iche gādi kwa, ndi nọ n'obi abua n'ihi nbib͕o nke oké osimiri na ebili-miri;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“A ga-enwe ihe ịrịbama nʼanyanwụ, nʼọnwa, na kpakpando. Nʼelu ụwa, mba niile ga-anọ nʼoke ahụhụ na mgbagwoju anya dị ka oke osimiri na-eme mkpọtụ, ebili mmiri ga na-ebilikwa.