Luke 21:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụfọdụ nꞌime ndị nọ nꞌebe ahụ bidoro ikwu okwu banyere ụlọ nsọ ukwu Chineke ahụ. Ha nọ na-ekwu okwu banyere otu ụlọ ahụ si maa mma, na nkume ọma e ji wuo ya. Ha kwukwara okwu banyere ụdị onyinye ndị mmadụ na-eche nꞌihu Chineke nꞌime ya.
Igbo 2006
Mb͕e ufọdu nēkwu okwu bayere ulo uku Chineke, na ewereri nkume ọma na ihe enyere Chineke dozie ya, O we si,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ụfọdụ na-ekwu okwu banyere otu e si were nkume mara mma na onyinye e chere nʼihu Chineke, chọọ ụlọnsọ ukwu ahụ mma, ọ sịrị,