Luke 21:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Jisọs zara ha sị, “Oge na-abịa mgbe ihe ndị a nile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. O nweghị otu nkume dị nꞌebe a nke ga-adịkwa nꞌelu ibe ya. A ga-akwatụ ihe nile.”
Igbo 2006
Ihe ndia nke unu nēkiri, ubọchi gābia, nke anāgaghi-arapu otù nkume n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma banyere ihe ndị a, oge na-abịa mgbe ihe ndị a niile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. Ọ dịghị otu nkume a ga-ahapụ nʼelu ibe ya, a ga-akwatusị ha niile.”