Luke 21:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu ga-anụ akụkọ agha na ọgba aghara nꞌebe nile, ma ka ụjọ ghara ịtụ unu. Nꞌihi na ihe ndị a nile ga-ebu ụzọ mezuo, ma nke a egosighị na ọgwụgwụ ihe nile abịala.
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ bula unu gānu okwu agha di iche iche na aghara di iche iche, unu atula ujọ: n'ihi na ihe ndia aghaghi ibu uzọ puta; ma ọgwugwu ihe nile adighi-eru ngwa ngwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọbụla unu nụrụ akụkọ agha dị iche iche na ọgbaaghara, ka ụjọ ghara ịtụ unu, ihe ndị a aghaghị ibu ụzọ mezuo, ma ọgwụgwụ oge erubeghị.”