Luke 22:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs zara ha sị, “Gaanụ nꞌime obodo. Mgbe unu na-abanye unu ga-ezute otu nwoke bu ite mmiri. Soronụ ya gaa ebe ọ bụla ọ na-aga. Sorokwanụ ya baa nꞌụlọ ọ banyere. Nꞌebe ahụ leenụ ihe unu ga-agwa onye nwe ụlọ ahụ, ‘Onye ozizi anyị sị anyị jụọ gị ọnụ ụlọ ị kwadoro ka ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ rie oriri Ngabiga nke ha.’
Igbo 2006
Ọ si ha, Le, mb͕e unu batasiri nime obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute unu; sonu ya ba n'ulo nke ọ nābà nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ha, “Lee, ka unu na-abata nʼobodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu, soronụ ya baa nʼụlọ ọbụla ọ banyere.