Luke 22:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌụzọ dị otu ahụ kwa, o buliri iko mmanya mgbe ha risiri nri anyasị kwuo okwu sị, “Mmanya a nọchiri anya ọbara m nke a na-awụsị nꞌihi unu, ime ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ Chineke guzosie ike.
Igbo 2006
Mb͕e ha risiri nri-anyasi Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram, bú nke anāwusi n'ihi unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼotu ụzọ ahụ, mgbe ha risiri nri anyasị o buuru iko sị, “Iko a bụ iko nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m, nke a na-awụpụ nʼihi unu.