Luke 22:27 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ònye ka ibe ya ukwuu? Ọ̀ bụ onye batara nꞌụlọ nọdụ nꞌelu tebulu rie nri, ka ọ bụ onye ahụ na-esi nri, dozie ya nꞌelu tebulu? Unu maara na ọ bụ onye ahụ batara nọdụ rie nri dị ukwuu karịa onye na-esi nri esi. Ma nꞌebe unu nọ, adị m ka onye na-ejere unu ozi.
Igbo 2006
N'ihi na ònye ka ibe-ya uku, onye nānọdu na nri, ma-ọbu onye nēje ozi? ọ̀ bughi onye nānọdu na nri? ma Mu onwem di n'etiti unu ka onye nēje ozi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye dị elu karịa ibe ya? Ọ bụ onye nọdụrụ ala rie nri na tebul ka ọ bụ onye siri nri dozie ya na tebul? Ọ bụghị onye nọdụrụ ala rie nri na tebul? Ma adị m ka onye na-eje ozi nʼetiti unu.