Luke 22:36 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha okwu sị, “Ugbu a, ka onye ọ bụla nwere ego were ya, ka onye nwere akpa sere ya. Ọ bụrụkwa na ọ dị onye na-enweghị mma agha, ya ree uwe ya, nweta ego zụrụ otu.
Igbo 2006
O we si ha, Ma ub͕u a, onye nwere àkpà-ego, ya were ya, onye nwere àkpà-ije, ya were kwa ya: ma onye nēnweghi, ya re uwe-ya, zuta mma-agha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ha, “Ugbu a, ọ bụrụ na i nwere akpa ego, were ya, ma werekwa akpa ije. Ọ bụrụkwa na i nweghị mma agha ree uwe mgbokwasị gị zụtara onwe gị otu.