Luke 22:37 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu mgbe m na-asị na ihe ahụ akwụkwọ nsọ kwuru banyere m sị, ‘A gụkọrọ ya na ndị mmehie’, ga-emezu.”
Igbo 2006
N'ihi na asim unu, na ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu n'arum, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya: n'ihi na ihe dirim nwere ọgwugwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na agwa m unu, na a ga-emejupụta ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ nʼime m, A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. Nʼezie, ihe e dere banyere m eruwela mgbe ọ ga-emezu.”