Luke 22:47 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ọ kpụ okwu a nꞌọnụ, o leliri anya hụ igwe mmadụ ka ha na-abịa nꞌebe ọ nọ. Ọ bụ nwoke a na-akpọ Judas otu nꞌime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya du ha. Mgbe ha bịarutere Jisọs nso, Judas pụtara bakụọ Jisọs sutu ya ọnụ.
Igbo 2006
Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, ìgwè madu biara; onye ahu anākpọ Judas, bú otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, buru kwa ha uzọ nābia; o we bia rue Jisus nso isutu Ya ọnu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe mmadụ bịara, onye du ha bụ onye a na-akpọ Judas, bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya. Ọ bịaruru Jisọs nso, isutu ya ọnụ.