Luke 22:52 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs tụgharịrị gwa ndị isi nchụaja ahụ, na ndị isi agha ahụ na-eche ụlọ nsọ ukwu ahụ, na ndị okenye ahụ bịara ijide ya okwu sị, “Ùnu chịịrị mma agha na osisi bịa ijide m dị ka a ga-asị na m bụ onye na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike?
Igbo 2006
Jisus we si ndi-isi-nchu-àjà, na ndi-ọchi-agha nke ulo uku Chineke, na ndi-okenye, ndi biara imegide Ya, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi, dika imegide onye nāpunara madu ihe?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Jisọs sịrị ndịisi nchụaja, na ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu na ndị okenye, “Gịnị mere unu ji chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m, dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi o ji egbe ezu?