Luke 22:53 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụbọchị nile ka mụ na unu na-anọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ, ma unu emetụghị m aka. Ma nke a bụ oge unu, mgbe Chineke kpebiri inye ekwensu ohere igosi ike ya.”
Igbo 2006
Mb͕e Mu na unu nọ kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke, unu esetighi aka-unu imegidem: ma nka bu oge hour unu, na ike nke ọchichiri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe mụ na unu na-anọ kwa ụbọchị nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, ma unu emetụghị m aka. Ma ugbu a bụ oge awa unu bụrụkwa mgbe ike ọchịchịrị na-achị achị.”