Luke 22:61 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs tụgharịrị lee Pita anya. Mgbe ahụ kwa Pita chetara okwu ahụ Jisọs gwara ya. Nꞌihi na ọ gwara Pita sị, “Tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa taa, ugbo atọ ka ị ga-agọnarị m.”
Igbo 2006
Onye-nwe-ayi we chigharia, le Pita anya. Pita we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ta, i gāgọnarim ub͕ò atọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tụgharịrị lee Pita anya. Pita chetakwara okwu Onyenwe anyị gwara ya nke bụ, “Tupu oke ọkpa akwa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”