Luke 22:70 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ ha bidoro ịjụ ya ajụjụ sị, “Ihe ị na-ekwu ọ bụ na ị bụ Ọkpara Chineke?” Jisọs zara sị ha, “Ee, ọ bụ dị ka unu si kwuo ya.”
Igbo 2006
Ha nile si, Gì onwe-gi bu kwa Ọkpara Chineke? Ọ si ha, Unu onwe-unu si na Mu onwem bu Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha niile sịrị, “Gị onwe gị, ị bụ Ọkpara Chineke?” Ọ sịrị ha, “Unu kwuru na Abụ m.”