Luke 23:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ha ruru nꞌihu Pailet ha malitere ibo ya ebubo na-asị, “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eduhie ndị ala anyị. Ọ na-ezi ha na o zighị ezi ịtụ ụtụ taksị nye Siza. Ọ na-agwakwa ha na ya onwe ya bụ Kraịst, bụrụkwa eze.”
Igbo 2006
Ha we malite ibo Ya ebubo, si, Ayi huru Onye a, ka O nēduhie mba-ayi, nēb͕ochi ha itu ùtú nye Sisa, nāsi kwa na Ya onwe-ya bu Kraist, buru kwa Eze.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha malitere ibo ya ebubo na-asị, “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eduhie ndị obodo anyị niile, na-egbochikwa ha ịtụ ụtụ isi nye Siza, ma na-ekwukwa na ya bụ Kraịst, Eze.”