Luke 23:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ha duuru Jisọs na-aga ebe ha ga-anọ kpọgide ya nꞌobe, ha zutere otu nwoke aha ya bụ Saimọn onye obodo Sirini. O si nꞌime obodo a na-abịa Jerusalem. Ha kwagidere ya bokwasị ya obe ahụ ka ọ buru ya na-eso Jisọs nꞌazụ.
Igbo 2006
Mb͕e ha nēdupu Ya, ha we jide otù onye, bú Saimon, onye Sairini, nke si n'azu obodo ahu bia, ha we bokwasi ya obe-Ya, ka o buru ya so Jisus.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dị ka ha duu ya na-aga, ha jidere Saimọn onye Sirini bụ onye si nʼime otu obodo nta na-alọbata; ha boro ya obe ahụ, manye ya ka o buru ya na-eso Jisọs na-azụ.