Luke 23:35 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọtụtụ mmadụ guzoro na-ele Jisọs anya. Kama ndị ndu ndị Juu nọ na-achị ya ọchị. Ha gwara ya okwu sị, “Leenụ ya ugbu a! Ọ na-azọpụta ndị ọzọ ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. A sị na ọ bụ Onye nzọpụta, onye Chineke họpụtara, ya zọpụtanụ onwe ya.”
Igbo 2006
Ndi-Ju nēguzo kwa, nēkiri. Ndi-isi we me kwa Ya ihe-ọchì, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ya zọputa Onwe-ya, ọ buru na Onye a bu Kraist nke Chineke, Onye Ọ rọputara.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị mmadụ guzoro ebe ahụ na-ele anya, ka ndị ọchịchị ji ya na-eme ihe ọchị, na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ya zọpụtanụ onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ bụ Kraịst nke Chineke, bụ Onye a họpụtara.”