Luke 23:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ha nọgidere gwasie ya okwu ike sị ya, “Nwoke a na-akwalị ndị Juu nile inupụ isi. Na Galili ka ọ malitere izi ihe. O ziekwala ndị Juda nile ozizi nnupụ isi ya. Ugbu a, o webatakwala ozizi ya nꞌebe a.”
Igbo 2006
Ma ha kwusiri ike kari, si, Ọ nākwali ndi-Ju, nēzí ihe n'ebe nile di na Judia dum, nāmalite kwa site na Galili rue ebe a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ha gara nʼihu na-asị, “Ọ na-akpasu ọgbaaghara nʼala ndị Judịa niile site nʼozizi ya. Ọ malitere na Galili, ọ bịakwala ebe a ugbu a.”