Luke 23:53 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Pailet nyere ya ike, Josef gara butuo ozu Jisọs site nꞌelu obe ahụ. O ji akwa ọcha dị ogologo kechie ozu ahụ. Emesịa, o nyibere ya nꞌili ọhụrụ o gwuru nꞌime nkume nke a enyisabeghị onye ọ bụla nꞌime ya mbụ.
Igbo 2006
O we budata ya, ke ya n'ezi ákwà ọcha, we tọb͕ọ Ya n'ílì nke egwuwara ya-ri na nkume, nke akātọb͕ọghi onye ọ bula nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, o budatara ya fụchie ya nʼakwa ọcha linin, tinye ya nʼili e gwuru nʼọgba nkume, nke a na-etinyebeghị mmadụ na mbụ.