Luke 23:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ha gwara ya na Jisọs bụ onye Galili, o nyere iwu ka e duru ya jekwuru Herọd, bụ eze, onye ọchịchị ala Galili dị nꞌaka. Nꞌoge a Herọd nꞌonwe ya nọkwa na Jerusalem.
Igbo 2006
Mb͕e ọ mazuru na O si n'ebe Herod nāchi bia, o we ziga Ya jekuru Herod, onye ya onwe-ya nọ kwa na Jerusalem na mb͕e ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ matara na o si nʼebe Herọd na-achị, o nyere iwu ka e dugara ya Herọd, onye nọkwa na Jerusalem mgbe ahụ.