Luke 23:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Obi tọrọ Herọd ụtọ mgbe ọ hụrụ Jisọs nꞌihi na ọ dịlarị anya kemgbe ọ chọrọ ịhụ ya anya ihu na ihu. Nꞌihi na ọ nụla ọtụtụ akụkọ banyere Jisọs. O lekwara anya na Jisọs ga-arụ ọrụ ịrịba ama nꞌihu anya ya. Ọ nụla akụkọ Jisọs, nꞌihi ya o nwere olileanya na Jisọs ga-arụrụ ya ụfọdụ nꞌime ọrụ ebube ahụ ọ na-arụ.
Igbo 2006
Ma mb͕e Herod huru Jisus, Ọ ṅuria ọṅu nke-uku: n'ihi na ọ nāchọ ihu Ya anya n'oge di anya gara aga, n'ihi na ọ nuru ihe bayere Ya; o we nēle anya ihu ihe-iriba-ama di aṅa Ọ gēme.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu, mgbe ọ hụrụ Jisọs nʼihi na ọ nọ na-achọ ịhụ ya anya nʼoge dị anya gara aga. Sitekwa nʼakụkọ ọ nụrụ banyere ya, o lere anya na ọ ga-arụ ọrụ ebube ụfọdụ.