Luke 24:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ gaa nꞌili ahụ ka o jiri anya ya hụ ihe mere. Mgbe o ruru, o hulatara ala nyoo anya nꞌime ili ahụ hụ akwa ahụ e ji kee ahụ Jisọs ka ọ tọgbọ nꞌala. Mgbe ọ hụrụ ihe ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ laghachi azụ nꞌụlọ, na-echekwa echiche banyere ihe ndị ahụ mere.
Igbo 2006
Ma Pita biliri, b͕a ọsọ jerue ílì; o we ruru ala, nyo nime ya, we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ nání ha; o we la n'ulo-ya, ihe nke meworo nēju kwa ya anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara.