Luke 24:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịjụ ha ajụjụ sị, “Akụkọ gịnị ka unu na-akọ?” Mmadụ abụọ ahụ kwụsịrị ịga ije mgbe ajụjụ a dara. Onye lere ha anya nꞌihu ga-ama nꞌezie na ha nọ nnọọ nꞌiru uju.
Igbo 2006
O we si ha, Gini bu okwu ndia unu nāgwarita onwe-unu, ka unu nāga ije? Ha we guzo nāb͕aru iru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-ekwurịta nʼetiti onwe unu dị ka unu na-aga nʼụzọ.” Ha kwụsịrị ebe ahụ, gbarụọ ihu ha.