Luke 24:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ otu onye nꞌime ha aha ya bụ Kliopas zara Jisọs sị, “Ị̀ na-akọwa na ị maghị ihe ọ bụla banyere ihe nile a mere na Jerusalem nꞌizu ụka gara aga? Ị ga-abụkwanụ nnọọ onye ọbịa ma ọ bụrụ na ị maghi ihe ndị a!”
Igbo 2006
Otù onye nime ha, aha-ya bu Kleopas, we za, si Ya, Ọ̀ bu nání Gi onwe-gi nọ dika ọbìa na Jerusalem nāmaghi ihe mere nime ya n'ubọchi ndia?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu onye nʼime ha a na-akpọ Kleopas, sịrị ya, “Ị bụ onye ọbịa na Jerusalem nke mere na ị maghị ihe mere nʼime ya nʼụbọchị ndị a?”