Luke 24:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ihe ndị a unu sị na o mere?” Ha zara ya sị, “Ihe dakwasịrị Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma rụrụ ọrụ ebube dị iche iche, onye kwukwara okwu na-atụghị egwu. Onye, ọ bụladị Chineke na mmadụ na-asọpụrụ.
Igbo 2006
Ọ si ha, Ihe gini? Ha si Ya, Ihe bayere Jisus Onye Nazaret, Onye bu onye-amuma di ike n'ọlu na okwu n'iru Chineke na ndi-Ju nile:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ha, “Gịnị bụ ihe mere?” Ha sịrị ya, “Banyere Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma bụrụkwa onye dị ike, ma nʼokwu ma nʼomume nʼihu Chineke na mmadụ niile.