Luke 24:31 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌoge ahụ kwa Chineke meghere anya ha, mee ka ha ghọta na ọ bụ Jisọs ka ha na ya nọ. Ma nꞌotu mgbe ahụ ha matara na ọ bụ ya, Jisọs gbara barịị, fuo. Ha ahụkwaghị ya anya ọzọ.
Igbo 2006
Ewe saghe anya-ha, ha we mara Ya; Ya onwe-ya we funari n'anya-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, e meghere anya ha, ha amata onye ọ bụ, ha ahụkwaghị ya anya ọzọ.