Luke 24:41 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma o siiri ndị na-eso ụzọ ya ike inwe mkpebi na ọ bụ ya nꞌezie. Ọṅụ jupụtara obi ha, ma otu aka ahụ kwa, ha jupụtara nꞌobi abụọ. Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ha sị, “Ọ dị ihe oriri unu nwere?”
Igbo 2006
Ma mb͕e ha nọ nēkweghi ekwe n'ihi ọṅù, mb͕e ọ nēju kwa ha anya, Ọ si ha, Ùnu nwere ihe-oriri ọ bula n'ebe a?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha, “Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?”