Luke 3:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ụfọdụ ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Ginị ka i kwuru maka anyi? Ginị ka anyị kwesịrị ime?” Jọn Zara sị ha, “Unu ejikwala ike apụnarị ndi mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ihe ahụ unu maara na ha emeghị. Ka afọ ju unu nꞌụgwọ a na-akwụ unu.”
Igbo 2006
Ndi-agha nēje ozi jukwara ya, si, Ayi onwe-ayi kwa, gini kwesiri ka ayi me? Ọ si ha, Unu ejidela onye ọ bula aka ike, ebokwala onye ọ bula ebubo ugha; ka afọ ju kwa unu n'ego-ọlu-unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Gịnịkwa ka anyị kwesiri ime?” Ọ sịrị ha, “Unu ejikwala ike apụnara ndị mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ebubo ụgha, ka afọ ju unu nʼụgwọ a na-akwụ unu.”