Luke 3:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌoge a, onye ọ bụla nọ na-ele ọbịbịa Onye nzọpụta ahụ. Ha nọkwa na-atule nꞌobi ha ma Jọn ọ bụ Onye nzọpụta ahụ.
Igbo 2006
Mb͕e ndi-Ju nọ nēle anya, mb͕e madu nile nātughari kwa n'obi-ha ihe bayere Jọn, ma eleghi anya ya onwe-ya bu Kraist ahu,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị mmadụ ji olileanya na-eche na-atulekwa nʼobi ha ma Jọn ọ bụ Kraịst ahụ.