Luke 3:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi nke a, Jọn gwara ha sị, “Eji m mmiri efu na-eme unu baptizim, ma ọ dị otu onye dị ukwuu karịa m, onye ga-abịa na mgbe na-adịghị anya. Ọ dị nnọọ ukwuu karịa m, nꞌihi na etozughị m ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nzọ na ọkụ mee unu baptizim.
Igbo 2006
Jọn zara, si ha nile, Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie; ma Onye kam ike nābia, Onye m'nērughi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim.