Luke 3:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu ụbọchị Jisọs sooro igwe mmadụ bịa ka Jọn mee ya baptizim. Mgbe Jọn mesịrị ndị mmadụ baptizim, o mekwara Jisọs baptizim. Ma mgbe Jisọs nọ na-ekpe ekpere, oge e mesịrị ya baptizim, eluigwe meghere.
Igbo 2006
Ma mb͕e emere ndi-Ju nile baptism, o rue, mb͕e emesikwara Jisus baptism, mb͕e Ọ nēkpe kwa ekpere, na emeghere elu-igwe,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe ọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere.