Luke 3:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mmụọ Nsọ sikwa nꞌelu rịdata dị ka nduru, bekwasị Jisọs nꞌisi. Nꞌotu oge ahụ olu sitere nꞌelu daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya. Ihe nile banyere gị na-atọ m ụtọ.”
Igbo 2006
Mọ Nsọ we fedakwasi Ya n'oyiyi aru, dika nduru, olu we site n'elu-igwe, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya; ihe-Gi dim ezi mma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”