Luke 4:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nꞌahụ m, nꞌihi na ọ họpụtala m ikwusa ozi ọma nye ndị ogbenye, Ọ họpụtala m ikwusa na ndị e kere agbụ ga-enwere onwe ha, na ndị kpuru ìsì ga-ahụkwa ụzọ ọzọ, na ndị a na-emegbu ga-esite nꞌaka ndị na-emegbu ha nwere onwe ha,
Igbo 2006
Mọ nke Onye-nwe-ayi di n'arum. N'ihi na O terem manu izì ndi-ob͕enye ozi ọma: O ziteworom ikwusa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, Na ikwusa ihu-uzọ gwa ndi-ìsi, Izipu ndi etihiawara aru ka ha la,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na o teela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ, ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì, ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha.