Luke 4:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ebe ahụ ka ọ nọ iri ụbọchị anọ ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. Iri ụbọchị anọ ndị a nile o righị nri ọ bụla. Nꞌikpeazụ, agụụ gụrụ ya.
Igbo 2006
ekwensu nānwà kwa Ya ọgu ubọchi abua. O righi kwa ihe ọ bula n'ubọchi ahu: mb͕e ubọchi ahu zuru, agu we gua Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebe ahụ ka ekwensu nwara ya ọnwụnwa iri ụbọchị anọ. Nʼụbọchị ndị ahụ niile o righị nri ọbụla. Nʼikpeazụ agụụ gụrụ ya.